1 Samuel 10

1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? 2Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’

3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. 4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.

5“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma. 6Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche. 7Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.

8“Ị ga-aga Gilgal
Ebe mbụ e wuru ụlọnsọ Chineke nʼime ala Kenan bụ nʼobodo Gilgal. Jos 4:19-24
chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”

Sọl ebuo amụma

9Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ. 10Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma. 11Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”

12Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” 13Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.

14Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?”

Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”

15Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”

16Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.

17Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa,
Oge ọbụla ndị Izrel nwere ihe dị mkpa ha ga atule, ọ bụ nʼobodo Mizpa ka ha na-ezukọta Nkp 20:2; 21:1; 1Sa 7:5-6
ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
18Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’ 19Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”

20Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza
Ọ bụ site na-ịjụta ase nʼUrim na Tumim ka mmadụ ji amata ihe ọ ga-eme. Ọnụ 27:21; 1Sa 28:6
mara ebo Benjamin.
21O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya. 22Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?”

Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”

23Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 24Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!”

Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”

25Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.

26Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya. 27Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

Copyright information for IboBIU